Native Bible

Proverbs 31:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị e kwesiri inye mmanya bụ ndị ahụ na-ala nʼiyi, ndị ahụ nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nke obi.

Proverbs 31:6 in English

Proverbs 31:6 · Berean Standard Bible

Give strong drink to one who is perishing, and wine to the bitter in soul.

Context

4Lemuel nwa m, ọ bụghị ihe kwesiri ekwesi na ndị eze ga-aṅụ mmanya. O kwesikwaghị ka agụụ ịṅụ mmanya bụrụ ihe ga na-agụ ndị eze. 5Ka ha ghara ịṅụbiga mmanya oke si otu a chefuo ikpe ikpe ziri ezi dịka iwu kwuru. Ka ha gharakwa isite nʼịṅụbiga mmanya oke napụ ndị a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi ha kwesiri inweta. 6Ndị e kwesiri inye mmanya bụ ndị ahụ na-ala nʼiyi, ndị ahụ nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nke obi. 7Ka ha ṅụọ chefuo ọnọdụ ọjọọ ha, ka ha gharakwa icheta ọnọdụ nhụju anya ha. 8Jisie ike kwuchite ọnụ ndị ahụ na-enweghị ike ikwuru ọnụ onwe ha; kwuchitekwa ọnụ ndị niile ọnọdụ ha dị ala.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.