Ilu 31:8
Proverbs 31:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jisie ike kwuchite ọnụ ndị ahụ na-enweghị ike ikwuru ọnụ onwe ha; kwuchitekwa ọnụ ndị niile ọnọdụ ha dị ala.
Proverbs 31:8 in English
Proverbs 31:8 · Berean Standard Bible
Open your mouth for those with no voice, for the cause of all the dispossessed.
Context
6Ndị e kwesiri inye mmanya bụ ndị ahụ na-ala nʼiyi,
ndị ahụ nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nke obi. 7Ka ha ṅụọ chefuo ọnọdụ ọjọọ ha,
ka ha gharakwa icheta ọnọdụ nhụju anya ha. 8Jisie ike kwuchite ọnụ ndị ahụ na-enweghị ike ikwuru ọnụ onwe ha;
kwuchitekwa ọnụ ndị niile ọnọdụ ha dị ala. 9Kwusie okwu ike, kpeekwa ikpe ziri ezi.
Gbooro ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa ọgụ site nʼaka ndị na-emegbu ha. 10Nwanyị nwere ugwu* onye ga-achọtali ya?
Ọ dị oke ọnụ karịa nkume rubi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.