Ilu 30:3
Proverbs 30:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Amụtabeghị m amamihe, maọbụ ruo ịmata maka Onye Nsọ ahụ.
Proverbs 30:3 in English
Proverbs 30:3 · Berean Standard Bible
I have not learned wisdom, and I have no knowledge of the Holy One.
Context
1Ndị a bụ okwu Agọ, nwa Jake, onye Masa,
Okwu si nʼọnụ nwoke a zigaara Itiel na Ukal:
“Ike agwụla m, Chineke
ma a pụrụ imeri. 2Nʼezie, abụ m onye nzuzu karịa mmadụ ọbụla;*
Enweghị m ụdị nghọta ahụ mmadụ na-enwe. 3Amụtabeghị m amamihe,
maọbụ ruo ịmata maka Onye Nsọ ahụ. 4Olee onye na-arịgo nʼeluigwe na-arịdatakwa?
Onye ka ọ bụ, bụ onye jikọtara ifufe nʼaka ya?
Onye kwa weere akwa kechikọtaa osimiri niile nʼaka ya?
Onye hiwere oke nsọtụ ụwa niile? Onye ka ọ bụ?
Ọ bụrụ na ị ma onye ọ bụ, gịnị bụ aha ya?
Gịnịkwa bụ aha nwa ya? 5“Okwu ọnụ Chineke niile bụ ihe anụchara anụcha,
Ọ bụ ọta nye ndị na-agbaba nʼime ya izere ndụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.