Ilu 30:18
Proverbs 30:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ọ dị ihe atọ na-agbagwoju m anya, apụghị m ịghọta ha; mbaa, ha dị anọ!
Proverbs 30:18 in English
Proverbs 30:18 · Berean Standard Bible
There are three things too wonderful for me, four that I cannot understand:
Context
16Ala ili,
akpanwa nwanyị na-adịghị atụ ime,
ala nke mmiri na-adịghị eju afọ,
na ọkụ nke na-adịghị asị, ‘O zuola.’ 17“Onye ahụ na-akwa nna ya emo,
nke na-akpọkwa irubere nne ya isi asị,
ugolọma ga-atụrụ mkpụrụ anya ya,
udele ga-erikwa anụ ahụ ya. 18“Ọ dị ihe atọ na-agbagwoju m anya, apụghị m ịghọta ha;
mbaa, ha dị anọ! 19Otu ugo si efegharị na mbara eluigwe;
otu agwọ si akpụ nʼelu nkume,
otu ụgbọ mmiri si achọta ụzọ ya nʼoke osimiri;
na otu ịhụnanya si eto nʼetiti nwoke na nwaagbọghọ. 20“Nke bụ ụzọ nwanyị na-akwa iko,
Ọ na-eri ma hichaa ọnụ ya,
na-asị, ‘E meghị m ajọ ihe ọbụla.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.