Ilu 30:19
Proverbs 30:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu ugo si efegharị na mbara eluigwe; otu agwọ si akpụ nʼelu nkume, otu ụgbọ mmiri si achọta ụzọ ya nʼoke osimiri; na otu ịhụnanya si eto nʼetiti nwoke na nwaagbọghọ.
Proverbs 30:19 in English
Proverbs 30:19 · Berean Standard Bible
the way of an eagle in the sky, the way of a snake on a rock, the way of a ship at sea, and the way of a man with a maiden.
Context
17“Onye ahụ na-akwa nna ya emo,
nke na-akpọkwa irubere nne ya isi asị,
ugolọma ga-atụrụ mkpụrụ anya ya,
udele ga-erikwa anụ ahụ ya. 18“Ọ dị ihe atọ na-agbagwoju m anya, apụghị m ịghọta ha;
mbaa, ha dị anọ! 19Otu ugo si efegharị na mbara eluigwe;
otu agwọ si akpụ nʼelu nkume,
otu ụgbọ mmiri si achọta ụzọ ya nʼoke osimiri;
na otu ịhụnanya si eto nʼetiti nwoke na nwaagbọghọ. 20“Nke bụ ụzọ nwanyị na-akwa iko,
Ọ na-eri ma hichaa ọnụ ya,
na-asị, ‘E meghị m ajọ ihe ọbụla.’ 21“Ọ dị ihe atọ na-eme ka ụwa maa jijiji,
nʼokpuru ihe anọ nke ọ na-apụghị ịnagide,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.