Native Bible

Proverbs 30:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ala ili, akpanwa nwanyị na-adịghị atụ ime, ala nke mmiri na-adịghị eju afọ, na ọkụ nke na-adịghị asị, ‘O zuola.’

Proverbs 30:16 in English

Proverbs 30:16 · Berean Standard Bible

Sheol, the barren womb, land never satisfied with water, and fire that never says, ‘Enough!’

Context

14Ndị eze ha niile bụ mma agha ịkịrị eze ha bụkwa mma maka irichapụ ndị ogbenye site nʼụwa na ndị nọ nʼụkọ site nʼetiti mmadụ. 15“Etu nwere ụmụ nwanyị abụọ ndị na-eti, ‘Nye, nye.’ “Ọ dị ụzọ ihe atọ nke afọ na-adịghị eju. E, anọ dị na-adịghị asị, ‘O zuola.’ 16Ala ili, akpanwa nwanyị na-adịghị atụ ime, ala nke mmiri na-adịghị eju afọ, na ọkụ nke na-adịghị asị, ‘O zuola.’ 17“Onye ahụ na-akwa nna ya emo, nke na-akpọkwa irubere nne ya isi asị, ugolọma ga-atụrụ mkpụrụ anya ya, udele ga-erikwa anụ ahụ ya. 18“Ọ dị ihe atọ na-agbagwoju m anya, apụghị m ịghọta ha; mbaa, ha dị anọ!

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.