Native Bible

Proverbs 3:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile, adaberekwala na nghọta gị.

Proverbs 3:5 in English

Proverbs 3:5 · Berean Standard Bible

Trust in the LORD with all your heart, and lean not on your own understanding;

Context

3Ekwela ka ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi hapụ gị, kekwasị ha nʼolu gị, deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị.* 4Mgbe ahụ, ị ga-enwe ihuọma na ezi aha nʼanya Chineke na nʼihu mmadụ. 5Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile, adaberekwala na nghọta gị. 6Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ, ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie. 7A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị. Tụọ Onyenwe anyị egwu, kpọọkwa ihe ọjọọ asị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.