Ilu 3:13
Proverbs 3:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ onye chọtara amamihe, onye nwetara nghọta.
Proverbs 3:13 in English
Proverbs 3:13 · Berean Standard Bible
Blessed is the man who finds wisdom, the man who acquires understanding,
Context
11Nwa m nwoke ajụla ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị,
ike agwụla gị ịnagide ịba mba ya. 12Nʼihi na ọ bụ ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba,
dịka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba. 13Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ onye chọtara amamihe,
onye nwetara nghọta. 14Nʼihi na amamihe dị mma karịa ọlaọcha,
ọ bakwara uru karịa ọlaedo. 15Ọ dị oke ọnụahịa karịa ọla rubi,
ọ dịghị ihe na-amasị gị e ji atụnyere ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.