Ilu 3:14
Proverbs 3:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na amamihe dị mma karịa ọlaọcha, ọ bakwara uru karịa ọlaedo.
Proverbs 3:14 in English
Proverbs 3:14 · Berean Standard Bible
for she is more profitable than silver, and her gain is better than fine gold.
Context
12Nʼihi na ọ bụ ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba,
dịka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba. 13Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ onye chọtara amamihe,
onye nwetara nghọta. 14Nʼihi na amamihe dị mma karịa ọlaọcha,
ọ bakwara uru karịa ọlaedo. 15Ọ dị oke ọnụahịa karịa ọla rubi,
ọ dịghị ihe na-amasị gị e ji atụnyere ya. 16Ndụ ogologo dị nʼaka nri ya;
nʼaka ekpe ya ka akụnụba na nsọpụrụ dịkwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.