Native Bible

Proverbs 23:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Tinye uche gị nʼịdọ aka na ntị; gekwaa ntị nụrụ okwu ihe ọmụma niile.

Proverbs 23:12 in English

Proverbs 23:12 · Berean Standard Bible

Apply your heart to instruction and your ears to words of knowledge.

Context

10Anarala nwa na-enweghị nne na nna ala ya site nʼihigharị oke ala e gwunyere site nʼoge gara aga, 11nʼihi na onye mgbapụta ha dị ike; ya onwe ya ga-ekwuchitere ha ọnụ ha. 12Tinye uche gị nʼịdọ aka na ntị; gekwaa ntị nụrụ okwu ihe ọmụma niile. 13Ahapụla ịdọ ụmụ gị aka na ntị. Ha agaghị anwụ nʼihi na ị tiri ha ihe. 14Jiri mkpara tie ya ihe ma zọpụta ndụ ya site nʼọnwụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.