Ilu 12:5
Proverbs 12:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Echiche obi niile nke onye ezi omume bụ ihe ziri ezi, ma ndụmọdụ onye ajọ omume jupụtara nʼaghụghọ.
Proverbs 12:5 in English
Proverbs 12:5 · Berean Standard Bible
The plans of the righteous are just, but the counsel of the wicked leads to deceit.
Context
3Onye ajọ omume agaghị anọgide,
ma apụghị ihopu onye ezi omume. 4Ezi nwanyị bụ ọṅụ na okpueze di ya,
ma nwanyị na-eweta ihere dịka ire ure nʼọkpụkpụ di ya. 5Echiche obi niile nke onye ezi omume bụ ihe ziri ezi,
ma ndụmọdụ onye ajọ omume jupụtara nʼaghụghọ. 6Okwu niile nke ndị ajọ omume bụ ihe na-eweta ọnwụ,
ma okwu ndị omume ha ziri ezi na-anapụta ha. 7Ndị na-emebi iwu ga-ala nʼiyi,
ma ndị ezi omume ga-eguzosi ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.