Ilu 12:3
Proverbs 12:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ajọ omume agaghị anọgide, ma apụghị ihopu onye ezi omume.
Proverbs 12:3 in English
Proverbs 12:3 · Berean Standard Bible
A man cannot be established through wickedness, but the righteous cannot be uprooted.
Context
1Onye ọbụla na-ahụ ịdọ aka na ntị nʼanya na-ahụ ihe ọmụma nʼanya,
ma onye na-akpọ ịba mba asị bụ onye na-enweghị ụbụrụ isi. 2Ezi mmadụ na-anata ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị,
ma onye na-atụpụta atụmatụ ọjọọ ka ọ na-ama ikpe. 3Onye ajọ omume agaghị anọgide,
ma apụghị ihopu onye ezi omume. 4Ezi nwanyị bụ ọṅụ na okpueze di ya,
ma nwanyị na-eweta ihere dịka ire ure nʼọkpụkpụ di ya. 5Echiche obi niile nke onye ezi omume bụ ihe ziri ezi,
ma ndụmọdụ onye ajọ omume jupụtara nʼaghụghọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.