Proverbs 1:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị, bụrụkwa ihe ịnya nʼolu nye gị.
Proverbs 1:9 in English
Proverbs 1:9 · Berean Standard Bible
For they are a garland of grace on your head and a pendant around your neck.
Context
7Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite ihe ọmụma.*
Ọ bụkwa naanị ndị nzuzu bụ ndị na-adịghị anabata amamihe na ịdọ aka na ntị. 8Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị
ahapụkwala ndụmọdụ nne gị. 9Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị,
bụrụkwa ihe ịnya nʼolu nye gị. 10Nwa m, ọ bụrụ na ndị mmehie ara gị ụra,
ekwenyerela ha, Ekwela!* 11Ọ bụrụ na ha asị gị, “Bịa soro anyị; ka anyị zoo onwe anyị,
tigbuo onye ọbụla anyị hụrụ,
bụ onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.