Native Bible

Proverbs 1:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụ na ha asị gị, “Bịa soro anyị; ka anyị zoo onwe anyị, tigbuo onye ọbụla anyị hụrụ, bụ onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla.

Proverbs 1:11 in English

Proverbs 1:11 · Berean Standard Bible

If they say, “Come along, let us lie in wait for blood, let us ambush the innocent without cause,

Context

9Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị, bụrụkwa ihe ịnya nʼolu nye gị. 10Nwa m, ọ bụrụ na ndị mmehie ara gị ụra, ekwenyerela ha, Ekwela!* 11Ọ bụrụ na ha asị gị, “Bịa soro anyị; ka anyị zoo onwe anyị, tigbuo onye ọbụla anyị hụrụ, bụ onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla. 12Ka anyị loo ha na ndụ, dịka ala ili, loo ha kpamkpam dịka ndị na-arịda nʼolulu. 13Anyị ga-enwetakwa ọtụtụ ihe dị oke ọnụahịa, nke anyị ga-akwaju nʼụlọ anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.