Native Bible

Proverbs 1:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

nʼihi inweta ntụziaka nʼinwe uche, ime ezi omume na ikpe ziri ezi nke aghụghọ na-adịghị.

Proverbs 1:3 in English

Proverbs 1:3 · Berean Standard Bible

and for receiving instruction in wise living and in righteousness, justice, and equity.

Context

1Ndị a bụ ilu Solomọn nwa Devid, eze Izrel. 2Ọ bụ maka amamihe na ntụziaka, maka ịghọta okwu niile kwesiri ịghọta nke ọma, 3nʼihi inweta ntụziaka nʼinwe uche, ime ezi omume na ikpe ziri ezi nke aghụghọ na-adịghị. 4Nʼihi ime ka ndị na-enweghị uche nwee ezi uche, ka ndị na-eto eto nweta ihe ọmụma na izuzu ọma. 5Ka onye maara ihe gee ntị, tụkwasịkwa ihe nʼihe ọ maara, ka ndị nwere nghọta nwetakwa ezi ndụmọdụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.