Ọnụọgụgụ 33:4
Numbers 33:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
mgbe ndị ha nọ na-eli ụmụ ha niile ndị e buru ụzọ mụọ, bụ ndị Onyenwe anyị tigburu nʼetiti ha nʼihi na Onyenwe anyị kpere chi ha niile ikpe.
Numbers 33:4 in English
Numbers 33:4 · Berean Standard Bible
who were burying all their firstborn, whom the LORD had struck down among them; for the LORD had executed judgment against their gods.
Context
2Mosis, nʼonwe ya, dere usoro ije ha ndị a nʼakwụkwọ dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. 3Ha biliri njem site na Ramesis, nʼụbọchị nke iri na ise nʼọnwa nke mbụ, ụbọchị na-esota nke e mere Mmemme Ngabiga. Ha niile zọpụrụ ije nʼatụghị egwu nʼihu ndị Ijipt, 4mgbe ndị ha nọ na-eli ụmụ ha niile ndị e buru ụzọ mụọ, bụ ndị Onyenwe anyị tigburu nʼetiti ha nʼihi na Onyenwe anyị kpere chi ha niile ikpe. 5Ndị Izrel hapụrụ Ramesis, bịa maa ụlọ ikwu ha na Sukọt. 6Ha hapụrụ Sukọt bịaruo Etam, nke dị nʼọnụ ọnụ ọzara ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.