Ọnụọgụgụ 33:3
Numbers 33:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha biliri njem site na Ramesis, nʼụbọchị nke iri na ise nʼọnwa nke mbụ, ụbọchị na-esota nke e mere Mmemme Ngabiga. Ha niile zọpụrụ ije nʼatụghị egwu nʼihu ndị Ijipt,
Numbers 33:3 in English
Numbers 33:3 · Berean Standard Bible
On the fifteenth day of the first month, on the day after the Passover, the Israelites set out from Rameses. They marched out defiantly * in full view of all the Egyptians,
Context
1Ndị a bụ usoro mbili ije ụmụ Izrel, site nʼoge ha hapụrụ Ijipt dịka ha si nọọ nʼigwe nʼigwe. Ọ bụ Mosis na Erọn duuru ha nʼije ndị a. 2Mosis, nʼonwe ya, dere usoro ije ha ndị a nʼakwụkwọ dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. 3Ha biliri njem site na Ramesis, nʼụbọchị nke iri na ise nʼọnwa nke mbụ, ụbọchị na-esota nke e mere Mmemme Ngabiga. Ha niile zọpụrụ ije nʼatụghị egwu nʼihu ndị Ijipt, 4mgbe ndị ha nọ na-eli ụmụ ha niile ndị e buru ụzọ mụọ, bụ ndị Onyenwe anyị tigburu nʼetiti ha nʼihi na Onyenwe anyị kpere chi ha niile ikpe. 5Ndị Izrel hapụrụ Ramesis, bịa maa ụlọ ikwu ha na Sukọt.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.