Native Bible

Numbers 33:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị a bụ usoro mbili ije ụmụ Izrel, site nʼoge ha hapụrụ Ijipt dịka ha si nọọ nʼigwe nʼigwe. Ọ bụ Mosis na Erọn duuru ha nʼije ndị a.

Numbers 33:1 in English

Numbers 33:1 · Berean Standard Bible

These are the journeys of the Israelites when they came out of the land of Egypt by their divisions under the leadership of Moses and Aaron.

Context

1Ndị a bụ usoro mbili ije ụmụ Izrel, site nʼoge ha hapụrụ Ijipt dịka ha si nọọ nʼigwe nʼigwe. Ọ bụ Mosis na Erọn duuru ha nʼije ndị a. 2Mosis, nʼonwe ya, dere usoro ije ha ndị a nʼakwụkwọ dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. 3Ha biliri njem site na Ramesis, nʼụbọchị nke iri na ise nʼọnwa nke mbụ, ụbọchị na-esota nke e mere Mmemme Ngabiga. Ha niile zọpụrụ ije nʼatụghị egwu nʼihu ndị Ijipt,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.