Native Bible

Numbers 33:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mosis, nʼonwe ya, dere usoro ije ha ndị a nʼakwụkwọ dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.

Numbers 33:2 in English

Numbers 33:2 · Berean Standard Bible

At the LORD’s command, Moses recorded the stages of their journey. These are the stages listed by their starting points:

Context

1Ndị a bụ usoro mbili ije ụmụ Izrel, site nʼoge ha hapụrụ Ijipt dịka ha si nọọ nʼigwe nʼigwe. Ọ bụ Mosis na Erọn duuru ha nʼije ndị a. 2Mosis, nʼonwe ya, dere usoro ije ha ndị a nʼakwụkwọ dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. 3Ha biliri njem site na Ramesis, nʼụbọchị nke iri na ise nʼọnwa nke mbụ, ụbọchị na-esota nke e mere Mmemme Ngabiga. Ha niile zọpụrụ ije nʼatụghị egwu nʼihu ndị Ijipt, 4mgbe ndị ha nọ na-eli ụmụ ha niile ndị e buru ụzọ mụọ, bụ ndị Onyenwe anyị tigburu nʼetiti ha nʼihi na Onyenwe anyị kpere chi ha niile ikpe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.