Native Bible

Numbers 3:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyendu ezinaụlọ ndị Geshọn bụ Eliasaf nwa Lael.

Numbers 3:24 in English

Numbers 3:24 · Berean Standard Bible

and the leader of the families of the Gershonites was Eliasaph son of Lael.

Context

22Ọnụọgụgụ ndị ikom dị otu ọnwa gbagoo dị puku asaa na narị ise (7,500). 23Ndị ikwu Geshọn mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, nʼazụ ụlọ nzute. 24Onyendu ezinaụlọ ndị Geshọn bụ Eliasaf nwa Lael. 25Ọrụ dịrị ụmụ Geshọn bụ ilekọta ụlọ nzute ahụ, na ụlọ ikwu ya, na ihe mkpuchi ya, na akwa mgbochi ọnụ ụzọ ụlọ nzute. 26Ọ dịkwa ha nʼaka ilekọta akwa mgbochi niile nke ogige gbara ya gburugburu, na akwa e ji gechie ọnụ ụzọ ogige ahụ. Ha nwekwara ọrụ ilekọta ebe ịchụ aja, na ụdọ niile, na ozi niile metụtara ihe ndị a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.