Native Bible

Numbers 3:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ dịkwa ha nʼaka ilekọta akwa mgbochi niile nke ogige gbara ya gburugburu, na akwa e ji gechie ọnụ ụzọ ogige ahụ. Ha nwekwara ọrụ ilekọta ebe ịchụ aja, na ụdọ niile, na ozi niile metụtara ihe ndị a.

Numbers 3:26 in English

Numbers 3:26 · Berean Standard Bible

the curtains of the courtyard, the curtain for the entrance to the courtyard that surrounds the tabernacle and altar, and the cords—all the service for these items.

Context

24Onyendu ezinaụlọ ndị Geshọn bụ Eliasaf nwa Lael. 25Ọrụ dịrị ụmụ Geshọn bụ ilekọta ụlọ nzute ahụ, na ụlọ ikwu ya, na ihe mkpuchi ya, na akwa mgbochi ọnụ ụzọ ụlọ nzute. 26Ọ dịkwa ha nʼaka ilekọta akwa mgbochi niile nke ogige gbara ya gburugburu, na akwa e ji gechie ọnụ ụzọ ogige ahụ. Ha nwekwara ọrụ ilekọta ebe ịchụ aja, na ụdọ niile, na ozi niile metụtara ihe ndị a. 27Nke Kohat bụ ikwu ndị Aram, ndị Izha, ndị Hebrọn na ndị Uziel. Ndị a bụ ndị ikwu Kohat. 28Ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị otu ọnwa gbagoo dị puku asatọ na narị isii (8,600). Ọrụ dịrị ndị Kohat bụ ilekọta ebe nsọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.