Native Bible

Numbers 3:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị otu ọnwa gbagoo dị puku asatọ na narị isii (8,600). Ọrụ dịrị ndị Kohat bụ ilekọta ebe nsọ.

Numbers 3:28 in English

Numbers 3:28 · Berean Standard Bible

The number of all the males a month old or more was 8,600.* They were responsible for the duties of the sanctuary.

Context

26Ọ dịkwa ha nʼaka ilekọta akwa mgbochi niile nke ogige gbara ya gburugburu, na akwa e ji gechie ọnụ ụzọ ogige ahụ. Ha nwekwara ọrụ ilekọta ebe ịchụ aja, na ụdọ niile, na ozi niile metụtara ihe ndị a. 27Nke Kohat bụ ikwu ndị Aram, ndị Izha, ndị Hebrọn na ndị Uziel. Ndị a bụ ndị ikwu Kohat. 28Ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị otu ọnwa gbagoo dị puku asatọ na narị isii (8,600). Ọrụ dịrị ndị Kohat bụ ilekọta ebe nsọ. 29Ndị ikwu Kohat mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ndịda nke ebe nsọ. 30Onyendu ezinaụlọ ndị ikwu Kohat bụ Elizafan nwa Uziel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.