Native Bible

Numbers 26:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu ọ dị, ndị niile si nʼezinaụlọ Kora anwụchaghị.

Numbers 26:11 in English

Numbers 26:11 · Berean Standard Bible

However, the line of Korah did not die out.

Context

9ụmụ Eliab bụ Nemuel, Datan na Abiram. Datan na Abiram bụ ndị ndu ọgbakọ ahụ nupuru isi megide Mosis na Erọn. Ha sonyere ndị ahụ so Kora mgbe ha nupuru isi megide Onyenwe anyị. 10Ala meghere ọnụ ya, loo ha na Kora, ma ọkụ rechapụrụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ọzọ ahụ sonyere ha. Ọnwụ ha ghọrọ ihe ịdọ aka na ntị. 11Otu ọ dị, ndị niile si nʼezinaụlọ Kora anwụchaghị. 12Ụmụ ụmụ Simiọn dịka ikwu ha si dị bụ, site na Nemuel, ikwu Nemuel, site na Jamin, ikwu Jamin, site na Jakin, ikwu Jakin, 13Site na Zera, ikwu Zera, site na Shaul, ikwu Shaul.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.