Native Bible

Numbers 24:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị a bụ okwu o ji mechie amụma ya: “Onye ga-adị ndụ mgbe Chineke ga-eme ihe ndị a?

Numbers 24:23 in English

Numbers 24:23 · Berean Standard Bible

Once more Balaam lifted up an oracle, saying: “Ah, who can live unless God has ordained it?

Context

21Ọ hụrụ ndị Ken anya, kwuo okwu ya: “E, i bi ugbu a nʼebe e wusiri ike,* akwụ gị dị nʼime oke nkume ahụ! 22Ma, a ga-ebibi unu ndị Ken niile, mgbe Ashọ ga-adọta unu nʼagha.” 23Ndị a bụ okwu o ji mechie amụma ya: “Onye ga-adị ndụ mgbe Chineke ga-eme ihe ndị a? 24Ụgbọ mmiri ga-esi nʼọnụ mmiri Saiprọs bịa. Ha ga-eji ike dobe ndị Eba* na ndị Ashọ nʼokpuru ha, ma a ga-ebibikwa ha onwe ha.” 25Emesịa, Belam biliri laghachi nʼụlọ ya, ma Balak gbasoro ụzọ nke ya. 24:18 Ndị Edọm si nʼagbụrụ Ịsọ. Jen 36:1-9 24:21 Ya bụ nke nʼadịgide adịgide 24:24 Eba bụ nna nna ndị Hibru. Jen 10:21; 1Ih 1:25-27

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.