Ọnụọgụgụ 23:8
Numbers 23:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
M ga-esi aṅaa bụọ onye Chineke na-abụghị ọnụ ọnụ? M ga-esi aṅaa kọchaa onye Onyenwe anyị na-akọchaghị?
Numbers 23:8 in English
Numbers 23:8 · Berean Standard Bible
How can I curse what God has not cursed? How can I denounce what the LORD has not denounced?
Context
6Mgbe Belam lọghachiri ọ hụrụ ya ka o guzoro nʼakụkụ ihe aja ya ndị ahụ, ya na ndịisi Moab niile. 7Nke a bụ ozi Belam ziri:
“Balak esitela nʼobodo Aram kpọta m.
Eze Moab esitela nʼọwụwa anyanwụ nke ugwu ahụ kpọta m.
Ọ sịrị m, bịa bụọrọ m Jekọb ọnụ
bịa kwutọọ Izrel. 8M ga-esi aṅaa bụọ
onye Chineke na-abụghị ọnụ ọnụ?
M ga-esi aṅaa
kọchaa onye Onyenwe anyị na-akọchaghị? 9Esitela m nʼelu nkume ndị a hụ ha.
Elegidere m ha anya site nʼugwu ahụ,
hụ na ha bụ ndị biri onwe ha,
ndị dị iche site nʼetiti mba niile ọzọ. 10Onye pụrụ ịgụta ole uzuzu Jekọb dị?
Maọbụ gụta ole otu ụzọ nʼime nkewa anọ nke Izrel dị.
Ọ ga-atọ m ụtọ ịnwụ ụdị ọnwụ ndị na-eme ezi omume.
Ka ọgwụgwụ ndụ m bụrụ ihe nwere ike iyi nke ha!”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.