Ọnụọgụgụ 23:6
Numbers 23:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Belam lọghachiri ọ hụrụ ya ka o guzoro nʼakụkụ ihe aja ya ndị ahụ, ya na ndịisi Moab niile.
Numbers 23:6 in English
Numbers 23:6 · Berean Standard Bible
So he returned to Balak, who was standing there beside his burnt offering, with all the princes of Moab.
Context
4Chineke zutere ya nʼebe ahụ. Belam gwara ya sị, “Edoziela m ebe ịchụ aja asaa, gbukwaa otu oke ehi na otu ebule nʼelu ha niile nʼotu na otu.” 5Nʼoge a, Onyenwe anyị tinyere Belam ozi nʼọnụ sị ya, “Laghachi gaa zie Balak ozi a.” 6Mgbe Belam lọghachiri ọ hụrụ ya ka o guzoro nʼakụkụ ihe aja ya ndị ahụ, ya na ndịisi Moab niile. 7Nke a bụ ozi Belam ziri:
“Balak esitela nʼobodo Aram kpọta m.
Eze Moab esitela nʼọwụwa anyanwụ nke ugwu ahụ kpọta m.
Ọ sịrị m, bịa bụọrọ m Jekọb ọnụ
bịa kwutọọ Izrel. 8M ga-esi aṅaa bụọ
onye Chineke na-abụghị ọnụ ọnụ?
M ga-esi aṅaa
kọchaa onye Onyenwe anyị na-akọchaghị?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.