Ọnụọgụgụ 23:10
Numbers 23:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye pụrụ ịgụta ole uzuzu Jekọb dị? Maọbụ gụta ole otu ụzọ nʼime nkewa anọ nke Izrel dị. Ọ ga-atọ m ụtọ ịnwụ ụdị ọnwụ ndị na-eme ezi omume. Ka ọgwụgwụ ndụ m bụrụ ihe nwere ike iyi nke ha!”
Numbers 23:10 in English
Numbers 23:10 · Berean Standard Bible
Who can count the dust of Jacob or number even a fourth of Israel? Let me die the death of the righteous; let my end be like theirs!”
Context
8M ga-esi aṅaa bụọ
onye Chineke na-abụghị ọnụ ọnụ?
M ga-esi aṅaa
kọchaa onye Onyenwe anyị na-akọchaghị? 9Esitela m nʼelu nkume ndị a hụ ha.
Elegidere m ha anya site nʼugwu ahụ,
hụ na ha bụ ndị biri onwe ha,
ndị dị iche site nʼetiti mba niile ọzọ. 10Onye pụrụ ịgụta ole uzuzu Jekọb dị?
Maọbụ gụta ole otu ụzọ nʼime nkewa anọ nke Izrel dị.
Ọ ga-atọ m ụtọ ịnwụ ụdị ọnwụ ndị na-eme ezi omume.
Ka ọgwụgwụ ndụ m bụrụ ihe nwere ike iyi nke ha!” 11Balak sịrị Belam, “Gịnị bụ ihe a i mere m? Akpọtara m gị ka ị bụọrọ m ndị iro m ọnụ, ma ugbu a, ọ dịghị ihe ọzọ i mere karịa naanị ịgọzi ha!” 12Ma Belam zaghachiri sị ya, “Ọ bụghị ihe Onyenwe anyị tinyere m nʼọnụ ka m ga-ekwu?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.