Ọnụọgụgụ 23:11
Numbers 23:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Balak sịrị Belam, “Gịnị bụ ihe a i mere m? Akpọtara m gị ka ị bụọrọ m ndị iro m ọnụ, ma ugbu a, ọ dịghị ihe ọzọ i mere karịa naanị ịgọzi ha!”
Numbers 23:11 in English
Numbers 23:11 · Berean Standard Bible
Then Balak said to Balaam, “What have you done to me? I brought you here to curse my enemies, and behold, you have only blessed them!”
Context
9Esitela m nʼelu nkume ndị a hụ ha.
Elegidere m ha anya site nʼugwu ahụ,
hụ na ha bụ ndị biri onwe ha,
ndị dị iche site nʼetiti mba niile ọzọ. 10Onye pụrụ ịgụta ole uzuzu Jekọb dị?
Maọbụ gụta ole otu ụzọ nʼime nkewa anọ nke Izrel dị.
Ọ ga-atọ m ụtọ ịnwụ ụdị ọnwụ ndị na-eme ezi omume.
Ka ọgwụgwụ ndụ m bụrụ ihe nwere ike iyi nke ha!” 11Balak sịrị Belam, “Gịnị bụ ihe a i mere m? Akpọtara m gị ka ị bụọrọ m ndị iro m ọnụ, ma ugbu a, ọ dịghị ihe ọzọ i mere karịa naanị ịgọzi ha!” 12Ma Belam zaghachiri sị ya, “Ọ bụghị ihe Onyenwe anyị tinyere m nʼọnụ ka m ga-ekwu?” 13Mgbe ahụ, Balak sịrị ya, “Soro m bịa nʼebe ọzọ ebe ị ga-ahụ ha; ọ bụ naanị nsọtụ ọmụma ụlọ ikwu ha ka ị ga-ahụ, ị gaghị ahụ ha niile. Site nʼebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.