Ọnụọgụgụ 23:12
Numbers 23:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Belam zaghachiri sị ya, “Ọ bụghị ihe Onyenwe anyị tinyere m nʼọnụ ka m ga-ekwu?”
Numbers 23:12 in English
Numbers 23:12 · Berean Standard Bible
But Balaam replied, “Should I not speak exactly what the LORD puts in my mouth?”
Context
10Onye pụrụ ịgụta ole uzuzu Jekọb dị?
Maọbụ gụta ole otu ụzọ nʼime nkewa anọ nke Izrel dị.
Ọ ga-atọ m ụtọ ịnwụ ụdị ọnwụ ndị na-eme ezi omume.
Ka ọgwụgwụ ndụ m bụrụ ihe nwere ike iyi nke ha!” 11Balak sịrị Belam, “Gịnị bụ ihe a i mere m? Akpọtara m gị ka ị bụọrọ m ndị iro m ọnụ, ma ugbu a, ọ dịghị ihe ọzọ i mere karịa naanị ịgọzi ha!” 12Ma Belam zaghachiri sị ya, “Ọ bụghị ihe Onyenwe anyị tinyere m nʼọnụ ka m ga-ekwu?” 13Mgbe ahụ, Balak sịrị ya, “Soro m bịa nʼebe ọzọ ebe ị ga-ahụ ha; ọ bụ naanị nsọtụ ọmụma ụlọ ikwu ha ka ị ga-ahụ, ị gaghị ahụ ha niile. Site nʼebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.” 14Ya mere, eze Balak duuru Belam gaa nʼọhịa Zofim, nʼelu ugwu Pisga, wuo ebe ịchụ aja asaa nʼebe ahụ. O jikwa otu oke ehi, otu oke ehi, na otu ebule, otu ebule, chụọ aja nʼebe ịchụ aja ndị ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.