Ọnụọgụgụ 23:24
Numbers 23:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-ebili ọtọ dịka nne ọdụm, ha na-enugharị onwe ha dịka ọdụm, nke na-adịghị edina ala tutu o richaa ihe o gburu, ma ṅụọkwa ọbara ihe ahụ o tigburu!”
Numbers 23:24 in English
Numbers 23:24 · Berean Standard Bible
Behold, the people rise like a lioness; they rouse themselves like a lion, not resting until they devour their prey and drink the blood of the slain.”
Context
22Chineke kpọpụtara ha site nʼIjipt.
Ha dị ike dịka ehi ọhịa. 23Ọ dịghị mgbaasị ga-emegide ha.
Ọ dịkwaghị ịgba afa a pụrụ iji megide Izrel.
Nʼihi na ugbu a, ihe dị otu a ka a ga-ekwu banyere Jekọb
na Izrel. ‘Lee, ihe Chineke mere ha.’ 24Ha na-ebili ọtọ dịka nne ọdụm,
ha na-enugharị onwe ha dịka ọdụm,
nke na-adịghị edina ala tutu o richaa ihe o gburu,
ma ṅụọkwa ọbara ihe ahụ o tigburu!” 25Mgbe ahụ, Balak sịrị Belam, “Abụla ha ọnụ ma ọlị, ma ọ bụkwanụ gọzie ha ma ọlị.” 26Ma Belam zaghachiri, “Ọ bụ na m agwaghị gị, ihe ọbụla nke Onyenwe anyị ga-ekwu ka m ga-eme?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.