Ọnụọgụgụ 23:22
Numbers 23:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chineke kpọpụtara ha site nʼIjipt. Ha dị ike dịka ehi ọhịa.
Numbers 23:22 in English
Numbers 23:22 · Berean Standard Bible
God brought them out of Egypt with strength like a wild ox.
Context
20Chineke enyela m iwu sị m gọzie ha.
Ọ gọziela ha, a pụghịkwa ịgbanwe ya! 21“O nweghị ajọ ihe nke ahụrụ nʼime Jekọb,
ahụghịkwa mwute ọbụla nʼIzrel.
Onyenwe anyị Chineke ha nọnyeere ha.
Iti mkpu nke Eze dịkwa nʼetiti ha.* 22Chineke kpọpụtara ha site nʼIjipt.
Ha dị ike dịka ehi ọhịa. 23Ọ dịghị mgbaasị ga-emegide ha.
Ọ dịkwaghị ịgba afa a pụrụ iji megide Izrel.
Nʼihi na ugbu a, ihe dị otu a ka a ga-ekwu banyere Jekọb
na Izrel. ‘Lee, ihe Chineke mere ha.’ 24Ha na-ebili ọtọ dịka nne ọdụm,
ha na-enugharị onwe ha dịka ọdụm,
nke na-adịghị edina ala tutu o richaa ihe o gburu,
ma ṅụọkwa ọbara ihe ahụ o tigburu!”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.