Ọnụọgụgụ 23:21
Numbers 23:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“O nweghị ajọ ihe nke ahụrụ nʼime Jekọb, ahụghịkwa mwute ọbụla nʼIzrel. Onyenwe anyị Chineke ha nọnyeere ha. Iti mkpu nke Eze dịkwa nʼetiti ha.*
Numbers 23:21 in English
Numbers 23:21 · Berean Standard Bible
He considers no disaster for Jacob; He sees no trouble for Israel. The LORD their God is with them, and the shout of the King is among them.
Context
19Chineke agaghị agha ụgha, nʼihi na ọ bụghị mmadụ.
Ọ gaghị agbanwe obi ya, nʼihi na ọ bụghị nwa mmadụ.
O kwuola okwu, ma ghara ime ihe o kwuru?
O kwela nkwa ma ghara imezu nkwa o kwere? 20Chineke enyela m iwu sị m gọzie ha.
Ọ gọziela ha, a pụghịkwa ịgbanwe ya! 21“O nweghị ajọ ihe nke ahụrụ nʼime Jekọb,
ahụghịkwa mwute ọbụla nʼIzrel.
Onyenwe anyị Chineke ha nọnyeere ha.
Iti mkpu nke Eze dịkwa nʼetiti ha.* 22Chineke kpọpụtara ha site nʼIjipt.
Ha dị ike dịka ehi ọhịa. 23Ọ dịghị mgbaasị ga-emegide ha.
Ọ dịkwaghị ịgba afa a pụrụ iji megide Izrel.
Nʼihi na ugbu a, ihe dị otu a ka a ga-ekwu banyere Jekọb
na Izrel. ‘Lee, ihe Chineke mere ha.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.