Native Bible

Numbers 23:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Chineke agaghị agha ụgha, nʼihi na ọ bụghị mmadụ. Ọ gaghị agbanwe obi ya, nʼihi na ọ bụghị nwa mmadụ. O kwuola okwu, ma ghara ime ihe o kwuru? O kwela nkwa ma ghara imezu nkwa o kwere?

Numbers 23:19 in English

Numbers 23:19 · Berean Standard Bible

God is not a man, that He should lie, or a son of man, that He should change His mind. Does He speak and not act? Does He promise and not fulfill?

Context

17Ya mere, ọ lọghachiri azụ nʼebe ahụ Balak na ụmụ eze Moab guzoro nʼakụkụ ihe aja ha. Balak jụrụ ya sị, “Gịnị ka Onyenwe anyị sịrị?” 18Ma Belam zaghachiri sị ya: “Bilie ọtọ Balak, nụrụ ozi. Ṅaa ntị nʼokwu m, gị nwa Zipoa. 19Chineke agaghị agha ụgha, nʼihi na ọ bụghị mmadụ. Ọ gaghị agbanwe obi ya, nʼihi na ọ bụghị nwa mmadụ. O kwuola okwu, ma ghara ime ihe o kwuru? O kwela nkwa ma ghara imezu nkwa o kwere? 20Chineke enyela m iwu sị m gọzie ha. Ọ gọziela ha, a pụghịkwa ịgbanwe ya! 21“O nweghị ajọ ihe nke ahụrụ nʼime Jekọb, ahụghịkwa mwute ọbụla nʼIzrel. Onyenwe anyị Chineke ha nọnyeere ha. Iti mkpu nke Eze dịkwa nʼetiti ha.*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.