Ọnụọgụgụ 23:19
Numbers 23:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chineke agaghị agha ụgha, nʼihi na ọ bụghị mmadụ. Ọ gaghị agbanwe obi ya, nʼihi na ọ bụghị nwa mmadụ. O kwuola okwu, ma ghara ime ihe o kwuru? O kwela nkwa ma ghara imezu nkwa o kwere?
Numbers 23:19 in English
Numbers 23:19 · Berean Standard Bible
God is not a man, that He should lie, or a son of man, that He should change His mind. Does He speak and not act? Does He promise and not fulfill?
Context
17Ya mere, ọ lọghachiri azụ nʼebe ahụ Balak na ụmụ eze Moab guzoro nʼakụkụ ihe aja ha. Balak jụrụ ya sị, “Gịnị ka Onyenwe anyị sịrị?” 18Ma Belam zaghachiri sị ya:
“Bilie ọtọ Balak, nụrụ ozi.
Ṅaa ntị nʼokwu m, gị nwa Zipoa. 19Chineke agaghị agha ụgha, nʼihi na ọ bụghị mmadụ.
Ọ gaghị agbanwe obi ya, nʼihi na ọ bụghị nwa mmadụ.
O kwuola okwu, ma ghara ime ihe o kwuru?
O kwela nkwa ma ghara imezu nkwa o kwere? 20Chineke enyela m iwu sị m gọzie ha.
Ọ gọziela ha, a pụghịkwa ịgbanwe ya! 21“O nweghị ajọ ihe nke ahụrụ nʼime Jekọb,
ahụghịkwa mwute ọbụla nʼIzrel.
Onyenwe anyị Chineke ha nọnyeere ha.
Iti mkpu nke Eze dịkwa nʼetiti ha.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.