Ọnụọgụgụ 23:18
Numbers 23:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Belam zaghachiri sị ya: “Bilie ọtọ Balak, nụrụ ozi. Ṅaa ntị nʼokwu m, gị nwa Zipoa.
Numbers 23:18 in English
Numbers 23:18 · Berean Standard Bible
Then Balaam lifted up an oracle, saying: “Arise, O Balak, and listen; give ear to me, O son of Zippor.
Context
16Ma Onyenwe anyị zutere Belam gwa ya ihe ọ ga-ekwu sị ya, “Laghachikwuru Balak zie ya ozi a.” 17Ya mere, ọ lọghachiri azụ nʼebe ahụ Balak na ụmụ eze Moab guzoro nʼakụkụ ihe aja ha. Balak jụrụ ya sị, “Gịnị ka Onyenwe anyị sịrị?” 18Ma Belam zaghachiri sị ya:
“Bilie ọtọ Balak, nụrụ ozi.
Ṅaa ntị nʼokwu m, gị nwa Zipoa. 19Chineke agaghị agha ụgha, nʼihi na ọ bụghị mmadụ.
Ọ gaghị agbanwe obi ya, nʼihi na ọ bụghị nwa mmadụ.
O kwuola okwu, ma ghara ime ihe o kwuru?
O kwela nkwa ma ghara imezu nkwa o kwere? 20Chineke enyela m iwu sị m gọzie ha.
Ọ gọziela ha, a pụghịkwa ịgbanwe ya!
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.