Native Bible

Numbers 23:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Balak sịrị Belam, “Abụla ha ọnụ ma ọlị, ma ọ bụkwanụ gọzie ha ma ọlị.”

Numbers 23:25 in English

Numbers 23:25 · Berean Standard Bible

Now Balak said to Balaam, “Then neither curse them at all nor bless them at all!”

Context

23Ọ dịghị mgbaasị ga-emegide ha. Ọ dịkwaghị ịgba afa a pụrụ iji megide Izrel. Nʼihi na ugbu a, ihe dị otu a ka a ga-ekwu banyere Jekọb na Izrel. ‘Lee, ihe Chineke mere ha.’ 24Ha na-ebili ọtọ dịka nne ọdụm, ha na-enugharị onwe ha dịka ọdụm, nke na-adịghị edina ala tutu o richaa ihe o gburu, ma ṅụọkwa ọbara ihe ahụ o tigburu!” 25Mgbe ahụ, Balak sịrị Belam, “Abụla ha ọnụ ma ọlị, ma ọ bụkwanụ gọzie ha ma ọlị.” 26Ma Belam zaghachiri, “Ọ bụ na m agwaghị gị, ihe ọbụla nke Onyenwe anyị ga-ekwu ka m ga-eme?” 27Mgbe ahụ, Balak sịrị Belam, “Bịa, aga m akpọrọ gị gaa nʼebe ọzọ. Eleghị anya ọ ga-amasị Chineke ka i si nʼebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.