Ọnụọgụgụ 18:27
Numbers 18:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-agụ onyinye unu wetara dịka ọ bụ onyinye ọka unu si nʼebe ịzọcha ọka weta, maọbụ dịka mmanya unu si nʼebe ịzọcha mmanya weta.
Numbers 18:27 in English
Numbers 18:27 · Berean Standard Bible
Your offering will be reckoned to you as grain from the threshing floor or juice from the winepress.
Context
25Onyenwe anyị gwakwara Mosis okwu sị, 26“Gwa ndị Livayị okwu sị, ‘Mgbe unu si nʼaka ụmụ Izrel nata onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ahụ m nyere unu dịka ihe nketa, unu aghaghị isite nʼonyinye ahụ nye otu ụzọ nʼime ụzọ iri dịka onyinye nye Onyenwe anyị. 27A ga-agụ onyinye unu wetara dịka ọ bụ onyinye ọka unu si nʼebe ịzọcha ọka weta, maọbụ dịka mmanya unu si nʼebe ịzọcha mmanya weta. 28Nʼụzọ dị otu a, unu onwe unu ga-eche onyinye unu nʼihu Onyenwe anyị site nʼonyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri unu si nʼaka ụmụ Izrel nata. Site nʼonyinye ndị a unu natara, unu ga-enye Erọn onye nchụaja onyinye ahụ ruuru Onyenwe anyị. 29Onyinye unu ga-enye dịka nke ruuru Onyenwe anyị ga-abụ akụkụ onyinye ndị ahụ kachasị mma, na ndị kachasị ịdị nsọ.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.