Native Bible

Numbers 18:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyinye unu ga-enye dịka nke ruuru Onyenwe anyị ga-abụ akụkụ onyinye ndị ahụ kachasị mma, na ndị kachasị ịdị nsọ.’

Numbers 18:29 in English

Numbers 18:29 · Berean Standard Bible

You must present the offering due the LORD from all the best of every gift, the holiest part of it.’

Context

27A ga-agụ onyinye unu wetara dịka ọ bụ onyinye ọka unu si nʼebe ịzọcha ọka weta, maọbụ dịka mmanya unu si nʼebe ịzọcha mmanya weta. 28Nʼụzọ dị otu a, unu onwe unu ga-eche onyinye unu nʼihu Onyenwe anyị site nʼonyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri unu si nʼaka ụmụ Izrel nata. Site nʼonyinye ndị a unu natara, unu ga-enye Erọn onye nchụaja onyinye ahụ ruuru Onyenwe anyị. 29Onyinye unu ga-enye dịka nke ruuru Onyenwe anyị ga-abụ akụkụ onyinye ndị ahụ kachasị mma, na ndị kachasị ịdị nsọ.’ 30“Gwa ndị Livayị okwu sị ha, ‘Mgbe unu wetara akụkụ onyinye ndị ahụ kachasị mma, a ga-agụnyere unu ya dịka a ga-asị na ọ bụ onyinye unu si nʼebe ịzọcha ọka, na nʼebe ịzọcha mmanya vaịnị unu weta. 31Unu na ezinaụlọ unu nwere ike iri ndị fọdụrụ nʼụlọ unu, maọbụ nʼebe ọbụla masịrị unu, nʼihi na ha bụ ụgwọ ọrụ unu nʼihi ozi niile unu jere nʼụlọ nzute.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.