Ọnụọgụgụ 18:25
Numbers 18:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị gwakwara Mosis okwu sị,
Numbers 18:25 in English
Numbers 18:25 · Berean Standard Bible
And the LORD instructed Moses,
Context
23Ọ bụ naanị ụmụ Livayị ga-arụ ọrụ nʼụlọ nzute ahụ. Ha ka ọ dịrị ibu ahụhụ ajọ omume ọbụla banyere ejezighị ozi nke ụlọ nzute. Ụkpụrụ a ga-adị ebighị ebi ruo ọgbọ niile dị nʼihu. Ndị Livayị agaghị enwe ihe nketa nke aka ha nʼetiti ụmụ Izrel. 24Kama, enyela m ndị Livayị onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ahụ niile ndị Izrel na-ewetara Onyenwe anyị ka ọ bụrụ ihe nketa ha. Ọ bụ nke a mere m ji kwuo sị, ‘Ha agaghị enweta ihe nketa nʼetiti ụmụ Izrel.’ ” 25Onyenwe anyị gwakwara Mosis okwu sị, 26“Gwa ndị Livayị okwu sị, ‘Mgbe unu si nʼaka ụmụ Izrel nata onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ahụ m nyere unu dịka ihe nketa, unu aghaghị isite nʼonyinye ahụ nye otu ụzọ nʼime ụzọ iri dịka onyinye nye Onyenwe anyị. 27A ga-agụ onyinye unu wetara dịka ọ bụ onyinye ọka unu si nʼebe ịzọcha ọka weta, maọbụ dịka mmanya unu si nʼebe ịzọcha mmanya weta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.