Native Bible

Numbers 18:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Gwa ndị Livayị okwu sị, ‘Mgbe unu si nʼaka ụmụ Izrel nata onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ahụ m nyere unu dịka ihe nketa, unu aghaghị isite nʼonyinye ahụ nye otu ụzọ nʼime ụzọ iri dịka onyinye nye Onyenwe anyị.

Numbers 18:26 in English

Numbers 18:26 · Berean Standard Bible

“Speak to the Levites and tell them: ‘When you receive from the Israelites the tithe that I have given you as your inheritance, you must present part of it as an offering to the LORD—a tithe of the tithe.

Context

24Kama, enyela m ndị Livayị onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ahụ niile ndị Izrel na-ewetara Onyenwe anyị ka ọ bụrụ ihe nketa ha. Ọ bụ nke a mere m ji kwuo sị, ‘Ha agaghị enweta ihe nketa nʼetiti ụmụ Izrel.’ ” 25Onyenwe anyị gwakwara Mosis okwu sị, 26“Gwa ndị Livayị okwu sị, ‘Mgbe unu si nʼaka ụmụ Izrel nata onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ahụ m nyere unu dịka ihe nketa, unu aghaghị isite nʼonyinye ahụ nye otu ụzọ nʼime ụzọ iri dịka onyinye nye Onyenwe anyị. 27A ga-agụ onyinye unu wetara dịka ọ bụ onyinye ọka unu si nʼebe ịzọcha ọka weta, maọbụ dịka mmanya unu si nʼebe ịzọcha mmanya weta. 28Nʼụzọ dị otu a, unu onwe unu ga-eche onyinye unu nʼihu Onyenwe anyị site nʼonyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri unu si nʼaka ụmụ Izrel nata. Site nʼonyinye ndị a unu natara, unu ga-enye Erọn onye nchụaja onyinye ahụ ruuru Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.