Native Bible

Numbers 13:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị a bụ aha ndị ikom ndị ahụ Mosis zipụrụ inyocha ala ahụ. (Ọ bụ nʼoge a ka Mosis gbanwere aha Hoshea nwa Nun, ka ọ bụrụ Joshua.)

Numbers 13:16 in English

Numbers 13:16 · Berean Standard Bible

These were the names of the men Moses sent to spy out the land; and Moses gave to Hoshea son of Nun the name Joshua.

Context

14Nabi nwa Vofusi, onye si nʼebo Naftalị. 15Geuel nwa Maki, onye si nʼebo Gad. 16Ndị a bụ aha ndị ikom ndị ahụ Mosis zipụrụ inyocha ala ahụ. (Ọ bụ nʼoge a ka Mosis gbanwere aha Hoshea nwa Nun, ka ọ bụrụ Joshua.) 17Mosis zipụrụ ha ịga ledoo ala Kenan, ọ sịrị, “Gbagoonụ site nʼụzọ Negev gakwanụ nʼala ugwu ugwu. 18Letanụ otu ala ahụ dị. Chọpụtanụ ụdị ndị bi nʼime ya, ma ha dị ike ma ha bụ ndị na-adịghị ike, ma ha dị ọtụtụ ma ha dị ole na ole.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.