Native Bible

Nehemiah 11:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

na Shabetai, na Jozabad, mmadụ abụọ na ndị ndu ndị Livayị, ndị ọ bụ ha na-arụ ọrụ dị nʼezi nke ụlọ Chineke;

Nehemiah 11:16 in English

Nehemiah 11:16 · Berean Standard Bible

Shabbethai and Jozabad, two leaders of the Levites, who supervised the work outside the house of God;

Context

14na ndị otu ya nʼọrụ ndị bụkwa dimkpa, dị otu narị na iri abụọ na asatọ (128) nʼọnụọgụgụ. Onyeisi ha bụ Zabdiel nwa Hagedolin. 15Site na ndị Livayị: Shemaya nwa Hashub, nwa Azrikam, nwa Hashabaya, nwa Buni, 16na Shabetai, na Jozabad, mmadụ abụọ na ndị ndu ndị Livayị, ndị ọ bụ ha na-arụ ọrụ dị nʼezi nke ụlọ Chineke; 17Matanaya nwa Mika, nwa Zabdi, nwa Asaf, bụ onyendu nke duru nʼekpere na ofufe ekele. Bakbukaya onye nke abụọ nʼetiti ndị otu ya, na Abda nwa Shamua, nwa Galal, nwa Jedutun, bụ ndị na-enyere ya aka. 18Ọnụọgụgụ ndị Livayị niile nọ na obodo nsọ ahụ dị narị abụọ na iri asatọ na anọ (284).

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.