Native Bible

Nehemiah 11:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

na ndị otu ya nʼọrụ ndị bụkwa dimkpa, dị otu narị na iri abụọ na asatọ (128) nʼọnụọgụgụ. Onyeisi ha bụ Zabdiel nwa Hagedolin.

Nehemiah 11:14 in English

Nehemiah 11:14 · Berean Standard Bible

and his associates *—128 mighty men of valor. Zabdiel son of Haggedolim was their overseer.

Context

12Ọnụọgụgụ ndị ikom ha na ha na-arụkọ ọrụ nʼụlọ ukwu ahụ bụ narị asatọ na iri abụọ na abụọ (822). Adaya, nwa Jeroham, nwa Pelalaya, nwa Amzi, nwa Zekaraya, nwa Pashua nwa Malkija, 13na ndị ikom bụ ndịisi ezinaụlọ ndị so ya rụọ ọrụ dị narị abụọ na iri anọ na abụọ (242) nʼọnụọgụgụ, Amashaị nwa Azarel, nwa Ahazai, nwa Meshilemot, nwa Imea, 14na ndị otu ya nʼọrụ ndị bụkwa dimkpa, dị otu narị na iri abụọ na asatọ (128) nʼọnụọgụgụ. Onyeisi ha bụ Zabdiel nwa Hagedolin. 15Site na ndị Livayị: Shemaya nwa Hashub, nwa Azrikam, nwa Hashabaya, nwa Buni, 16na Shabetai, na Jozabad, mmadụ abụọ na ndị ndu ndị Livayị, ndị ọ bụ ha na-arụ ọrụ dị nʼezi nke ụlọ Chineke;

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.