Native Bible

Nahum 2:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Kwakọrọnụ ọlaọcha, kwakọrọnụ ọlaedo dịka ihe a kwatara nʼagha. Akụnụba dị nʼụlọakụ ya na ihe ndị ọzọ bara uru nʼobodo ahụ, enweghị ọgwụgwụ.

Nahum 2:9 in English

Nahum 2:9 · Berean Standard Bible

“Plunder the silver! Plunder the gold!” There is no end to the treasure, an abundance of every precious thing.

Context

7E nyela ya ka ọ bụrụ iwu na obodo a aghaghị ịbụ obodo a dọtara nʼagha. Ndị ohu ha ndị inyom so ha nʼazụ na-akwa akwa dịka nduru, na-etikwa aka nʼobi. 8Ninive dịka ọdọ mmiri nke mmiri ya na-ehifusị. “Kwụsị! Kwụsị!” ka ha na-ebe, ma ọ dịghị onye ga-ele anya nʼazụ. 9Kwakọrọnụ ọlaọcha, kwakọrọnụ ọlaedo dịka ihe a kwatara nʼagha. Akụnụba dị nʼụlọakụ ya na ihe ndị ọzọ bara uru nʼobodo ahụ, enweghị ọgwụgwụ. 10E bibiela ya. A gbahapụla ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu. Obi ndị nọ nʼime ya na-alọ mmiri, ikpere ha niile na-ama jijiji, anụ ahụ ha niile na-amakwa jijiji, ihu niile achagharịakwala. 11Ebeekwa ka ọgba ọdụm ahụ dị ugbu a, bụ ebe ahụ ha na-anọ enye ụmụ ha nri, ebe oke ọdụm na nne ọdụm na-ejegharị, na ebe ụmụ ọdụm na-anọ na-atụghị egwu ihe ọbụla?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.