Nehum 2:9
Nahum 2:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kwakọrọnụ ọlaọcha, kwakọrọnụ ọlaedo dịka ihe a kwatara nʼagha. Akụnụba dị nʼụlọakụ ya na ihe ndị ọzọ bara uru nʼobodo ahụ, enweghị ọgwụgwụ.
Nahum 2:9 in English
Nahum 2:9 · Berean Standard Bible
“Plunder the silver! Plunder the gold!” There is no end to the treasure, an abundance of every precious thing.
Context
7E nyela ya ka ọ bụrụ iwu na obodo a
aghaghị ịbụ obodo a dọtara nʼagha.
Ndị ohu ha ndị inyom so ha nʼazụ na-akwa akwa dịka nduru,
na-etikwa aka nʼobi. 8Ninive dịka ọdọ mmiri
nke mmiri ya na-ehifusị.
“Kwụsị! Kwụsị!” ka ha na-ebe,
ma ọ dịghị onye ga-ele anya nʼazụ. 9Kwakọrọnụ ọlaọcha,
kwakọrọnụ ọlaedo dịka ihe a kwatara nʼagha.
Akụnụba dị nʼụlọakụ ya na ihe ndị ọzọ bara uru nʼobodo ahụ,
enweghị ọgwụgwụ. 10E bibiela ya. A gbahapụla ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu.
Obi ndị nọ nʼime ya na-alọ mmiri, ikpere ha niile na-ama jijiji,
anụ ahụ ha niile na-amakwa jijiji, ihu niile achagharịakwala. 11Ebeekwa ka ọgba ọdụm ahụ dị ugbu a,
bụ ebe ahụ ha na-anọ enye ụmụ ha nri,
ebe oke ọdụm na nne ọdụm na-ejegharị,
na ebe ụmụ ọdụm na-anọ na-atụghị egwu ihe ọbụla?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.