Nehum 2:8
Nahum 2:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ninive dịka ọdọ mmiri nke mmiri ya na-ehifusị. “Kwụsị! Kwụsị!” ka ha na-ebe, ma ọ dịghị onye ga-ele anya nʼazụ.
Nahum 2:8 in English
Nahum 2:8 · Berean Standard Bible
Nineveh has been like a pool of water throughout her days, but now it is draining away. “Stop! Stop!” they cry, but no one turns back.
Context
6Ma e megheela ọnụ ụzọ ama nke osimiri,
ụlọeze na-amakwa jijiji. 7E nyela ya ka ọ bụrụ iwu na obodo a
aghaghị ịbụ obodo a dọtara nʼagha.
Ndị ohu ha ndị inyom so ha nʼazụ na-akwa akwa dịka nduru,
na-etikwa aka nʼobi. 8Ninive dịka ọdọ mmiri
nke mmiri ya na-ehifusị.
“Kwụsị! Kwụsị!” ka ha na-ebe,
ma ọ dịghị onye ga-ele anya nʼazụ. 9Kwakọrọnụ ọlaọcha,
kwakọrọnụ ọlaedo dịka ihe a kwatara nʼagha.
Akụnụba dị nʼụlọakụ ya na ihe ndị ọzọ bara uru nʼobodo ahụ,
enweghị ọgwụgwụ. 10E bibiela ya. A gbahapụla ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu.
Obi ndị nọ nʼime ya na-alọ mmiri, ikpere ha niile na-ama jijiji,
anụ ahụ ha niile na-amakwa jijiji, ihu niile achagharịakwala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.