Native Bible

Nahum 2:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma e megheela ọnụ ụzọ ama nke osimiri, ụlọeze na-amakwa jijiji.

Nahum 2:6 in English

Nahum 2:6 · Berean Standard Bible

The river gates are thrown open and the palace collapses.

Context

4Ụgbọ agha na-eme mkpọtụ dị ukwuu nʼezi, ha na-agbagharị ihu na azụ nʼama niile. Ha na-enwu dịka ire ọkụ, na-agbagharịkwa dịka amụma. 5Ọ na-akpọkọta ndị agha ya a zụziri azụzi, ma ha na-asọ ngọngọ nʼije ha. Ha ji ọsọ gbaga ruo nʼelu mgbidi ha, dozie ọta nche ha niile nʼusoro. 6Ma e megheela ọnụ ụzọ ama nke osimiri, ụlọeze na-amakwa jijiji. 7E nyela ya ka ọ bụrụ iwu na obodo a aghaghị ịbụ obodo a dọtara nʼagha. Ndị ohu ha ndị inyom so ha nʼazụ na-akwa akwa dịka nduru, na-etikwa aka nʼobi. 8Ninive dịka ọdọ mmiri nke mmiri ya na-ehifusị. “Kwụsị! Kwụsị!” ka ha na-ebe, ma ọ dịghị onye ga-ele anya nʼazụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.