Nehum 2:6
Nahum 2:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma e megheela ọnụ ụzọ ama nke osimiri, ụlọeze na-amakwa jijiji.
Nahum 2:6 in English
Nahum 2:6 · Berean Standard Bible
The river gates are thrown open and the palace collapses.
Context
4Ụgbọ agha na-eme mkpọtụ dị ukwuu nʼezi,
ha na-agbagharị ihu na azụ nʼama niile.
Ha na-enwu dịka ire ọkụ,
na-agbagharịkwa dịka amụma. 5Ọ na-akpọkọta ndị agha ya a zụziri azụzi,
ma ha na-asọ ngọngọ nʼije ha.
Ha ji ọsọ gbaga ruo nʼelu mgbidi ha,
dozie ọta nche ha niile nʼusoro. 6Ma e megheela ọnụ ụzọ ama nke osimiri,
ụlọeze na-amakwa jijiji. 7E nyela ya ka ọ bụrụ iwu na obodo a
aghaghị ịbụ obodo a dọtara nʼagha.
Ndị ohu ha ndị inyom so ha nʼazụ na-akwa akwa dịka nduru,
na-etikwa aka nʼobi. 8Ninive dịka ọdọ mmiri
nke mmiri ya na-ehifusị.
“Kwụsị! Kwụsị!” ka ha na-ebe,
ma ọ dịghị onye ga-ele anya nʼazụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.