Nehum 2:4
Nahum 2:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụgbọ agha na-eme mkpọtụ dị ukwuu nʼezi, ha na-agbagharị ihu na azụ nʼama niile. Ha na-enwu dịka ire ọkụ, na-agbagharịkwa dịka amụma.
Nahum 2:4 in English
Nahum 2:4 · Berean Standard Bible
The chariots dash through the streets; they rush around the plazas, appearing like torches, darting about like lightning.
Context
2Onyenwe anyị ga-eme ka ịma mma Jekọb laghachi,
dịka ịma mma nke Izrel
ọ bụ ezie na ndị mbibi ebibiela ha,
lakwaa alaka osisi vaịnị ha niile nʼiyi. 3Ọta ndị agha ya na-acha ọbara ọbara,
ndị bụ dike nʼagha yikwa uwe na-acha uhie uhie.
Igwe e ji wuo ụgbọ agha na-egbu amụma
nʼụbọchị ahụ ha na-ejikere agha,
otu a kwa, ha na-efegharịkwa ùbe ha eji osisi fịa mee. 4Ụgbọ agha na-eme mkpọtụ dị ukwuu nʼezi,
ha na-agbagharị ihu na azụ nʼama niile.
Ha na-enwu dịka ire ọkụ,
na-agbagharịkwa dịka amụma. 5Ọ na-akpọkọta ndị agha ya a zụziri azụzi,
ma ha na-asọ ngọngọ nʼije ha.
Ha ji ọsọ gbaga ruo nʼelu mgbidi ha,
dozie ọta nche ha niile nʼusoro. 6Ma e megheela ọnụ ụzọ ama nke osimiri,
ụlọeze na-amakwa jijiji.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.