Mark 9:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha hụrụ Ịlaịja na Mosis ka ha pụtara soro Jisọs na-ekwu okwu.
Mark 9:4 in English
Mark 9:4 · Berean Standard Bible
And Elijah and Moses appeared before them, talking with Jesus.
Context
2Mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita na Jemis na Jọn, duru ha rigoro nʼelu ugwu dị elu. Nʼebe ahụ ka ha nọdụrụ naanị ha. Nʼebe ahụ, a gbanwere ọdịdị ya nʼihu ha. 3Uwe ya na-enwu ọcha karịa ụdị ọcha ọbụla anya hụrụla. Ọ dịkwa ọcha karịa nke onye ọbụla nʼụwa nwere ike ime ka ihe dị ọcha. 4Ha hụrụ Ịlaịja na Mosis ka ha pụtara soro Jisọs na-ekwu okwu. 5Pita gwara Jisọs sị, “Onye ozizi, ọ dị mma ka anyị nọdụ nʼebe a. Ka anyị wuo ụlọ ikwu atọ. Otu ga-abụ nke gị, otu a bụrụ nke Mosis, nke ọzọkwa a bụrụ nke Ịlaịja.” 6(Ọ makwaghị ihe ọ ga-ekwu nʼihi na oke egwu tụrụ ha.)
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.