Native Bible

Mark 9:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

(Ọ makwaghị ihe ọ ga-ekwu nʼihi na oke egwu tụrụ ha.)

Mark 9:6 in English

Mark 9:6 · Berean Standard Bible

For they were all so terrified that Peter did not know what else to say.

Context

4Ha hụrụ Ịlaịja na Mosis ka ha pụtara soro Jisọs na-ekwu okwu. 5Pita gwara Jisọs sị, “Onye ozizi, ọ dị mma ka anyị nọdụ nʼebe a. Ka anyị wuo ụlọ ikwu atọ. Otu ga-abụ nke gị, otu a bụrụ nke Mosis, nke ọzọkwa a bụrụ nke Ịlaịja.” 6(Ọ makwaghị ihe ọ ga-ekwu nʼihi na oke egwu tụrụ ha.) 7Mgbe ahụ, igwe ojii pụtara kpuchie ha. Olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya. Geenụ ya ntị.” 8Na mberede, mgbe ha lere anya gburugburu, ọ dịkwaghị onye ọzọ ha hụrụ, karịa naanị Jisọs.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.