Mark 9:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita na Jemis na Jọn, duru ha rigoro nʼelu ugwu dị elu. Nʼebe ahụ ka ha nọdụrụ naanị ha. Nʼebe ahụ, a gbanwere ọdịdị ya nʼihu ha.
Mark 9:2 in English
Mark 9:2 · Berean Standard Bible
After six days Jesus took with Him Peter, James, and John, and led them up a high mountain by themselves. There He was transfigured before them.
Context
1Ma ọ gwara ha sị, “Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe a, agaghị edetụ ọnwụ ire tupu ha ahụ alaeze Chineke mgbe ọ ga-abịa nʼike.” 2Mgbe ụbọchị isii gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita na Jemis na Jọn, duru ha rigoro nʼelu ugwu dị elu. Nʼebe ahụ ka ha nọdụrụ naanị ha. Nʼebe ahụ, a gbanwere ọdịdị ya nʼihu ha. 3Uwe ya na-enwu ọcha karịa ụdị ọcha ọbụla anya hụrụla. Ọ dịkwa ọcha karịa nke onye ọbụla nʼụwa nwere ike ime ka ihe dị ọcha. 4Ha hụrụ Ịlaịja na Mosis ka ha pụtara soro Jisọs na-ekwu okwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.