Mak 14:56
Mark 14:56 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọtụtụ bịara gbaa ama ụgha megide ya, ma ama ha abụghị otu.
Mark 14:56 in English
Mark 14:56 · Berean Standard Bible
For many bore false witness against Jesus, but their testimony was inconsistent.
Context
54Pita sooro ha, ma ọ nọ nʼebe dị anya. O sooro ha bata nʼobi onyeisi nchụaja. Nʼebe ahụ, o sooro ndị nche nọdụ ọdụ na-anya ọkụ. 55Ndịisi nchụaja na ndịisi ikpe nʼụlọikpe ukwu* nọ na-achọ ama megide Jisọs, ka ha nwee ike gbuo ya. Ma ọ dịghị nke ha chọtara. 56Ọtụtụ bịara gbaa ama ụgha megide ya, ma ama ha abụghị otu. 57Mgbe ahụ ụfọdụ biliri gbaa ama ụgha megide ya, sị, 58“Anyị nụrụ mgbe o kwuru sị, ‘Aga m akwatu ụlọnsọ ukwu a nke e ji aka wuo, nʼụbọchị atọ aga m ewukwa ụlọ ọzọ, nke a na-ejighị aka wuo.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.